Jeremaya 33

‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’

Jeremiah 33:3 (UKJV) Call unto me, and I will answer you, and show you great and mighty things, which you know not.

1Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya,

2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:

3‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’

4Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha

5nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.