Jeremaya 33

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:

Jeremiah 33:2 (UKJV) Thus says the LORD the maker thereof, the LORD that formed it, to establish it; the LORD is his name;

1Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya,

2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:

3‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’

4Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.