8Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.
9Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’
10“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa
11olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “ ‘ “Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.