Jeremaya 33

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.

Jeremiah 33:12 (UKJV) Thus says the LORD of hosts; Again in this place, which is desolate without man and without beast, and in all the cities thereof, shall be an habitation of shepherds causing their flocks to lie down.

10“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa

11olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “ ‘ “Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.

13Nʼime obodo niile nke dị nʼala ugwu ugwu, na nʼobodo niile nke dị na mgbada ugwu niile nke Negev, nʼoke ala Benjamin, nʼime obodo nta niile nke gbara Jerusalem gburugburu, na nʼime obodo niile nke Juda. Igwe ewu na atụrụ ga-agabigakwa ọzọ nʼokpuru aka abụọ nke onye na-agụ ha ọnụ.’ Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu.

14“ ‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.