Jeremaya 33

Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’

Jeremiah 33:16 (UKJV) In those days shall Judah be saved, and Jerusalem shall dwell safely: and this is the name wherewith she shall be called, The LORD our righteousness.

14“ ‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda.

15“ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ, aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.

16Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’

17Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel.

18Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.