Jeremaya 34

‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha.

Jeremiah 34:14 (UKJV) At the end of seven years let all of you go every man his brother an Hebrew, which has been sold unto you; and when he has served you six years, you shall let him go free from you: but your fathers hearkened not unto me, neither inclined their ear.

12Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

13“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị,

14‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha.

15Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m.

16Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.