Jeremaya 34

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị,

Jeremiah 34:13 (UKJV) Thus says the LORD, the God of Israel; I made a covenant with your fathers in the day that I brought them forth out of the land of Egypt, out of the house of bondmen, saying,

11Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.

12Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

13“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị,

14‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha.

15Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.