Jeremaya 34

Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.

Jeremiah 34:11 (UKJV) But afterward they turned, and caused the servants and the handmaids, whom they had let go free, to return, and brought them into subjection for servants and for handmaids.

9Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ.

10Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo.

11Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.

12Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

13“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.