8Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha.
9Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ.
10Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo.
11Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.
12Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,