Jeremaya 34

Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha.

Jeremiah 34:8 (UKJV) This is the word that came unto Jeremiah from the LORD, after that the king Zedekiah had made a covenant with all the people which were at Jerusalem, to proclaim liberty unto them;

6Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa Zedekaya eze Juda ihe ndị a niile na Jerusalem.

7Nʼoge a, ndị agha eze Babilọn na-ebuso Jerusalem agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo Lakish na Azeka. Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala Juda nke ndị agha Babilọn na-emeribeghị.

8Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha.

9Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ.

10Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.