Jeremaya 36

Ha jụrụ Baruk sị ya, “Gwa anyị i si aṅaa detuo ihe ndị a niile? Ọ bụ Jeremaya kpọpụtaara gị ihe i dere?”

Jeremiah 36:17 (UKJV) And they asked Baruch, saying, Tell us now, How did you write all these words at his mouth?

15Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ha gwara ya sị ya, “Biko, nọdụ ala gụọra anyị ihe dị nʼakwụkwọ a.” Ya mere, Baruk gụpụtara ha ihe dị nʼakwụkwọ ahụ.

16Mgbe ha nụchasịrị okwu dị nʼakwụkwọ ahụ, ha lerịtara onwe ha anya nʼegwu, gwa Baruk okwu sị ya, “Anyị aghaghị ime ka okwu ndị a ruo eze ntị.”

17Ha jụrụ Baruk sị ya, “Gwa anyị i si aṅaa detuo ihe ndị a niile? Ọ bụ Jeremaya kpọpụtaara gị ihe i dere?”

18Baruk zara sị ha, “E, ọ bụ ya kpọpụtara m okwu ndị a niile m deturu. E ji m inki dee ha nʼakwụkwọ.”

19Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.