22Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya.
23Mgbe ọbụla Jehudi gụsịrị ibe akwụkwọ atọ maọbụ anọ, eze na-anara ya akwụkwọ ndị ahụ were agụba ode akwụkwọ chakasịa ha, wụnye ha nʼọkụ. O megidere otu a tutu ruo mgbe ọ wụnyechara akwụkwọ ndị ahụ niile nʼọkụ.
24Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ.
25Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị.
26Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha.