24Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ.
25Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị.
26Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha.
27Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya:
28“Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ.