10A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”
11Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa,
12Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ.
13Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!”
14Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị.