Jeremaya 37

A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”

Jeremiah 37:10 (UKJV) For though all of you had smitten the whole army of the Chaldeans that fight against you, and there remained but wounded men among them, yet should they rise up every man in his tent, and burn this city with fire.

8Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’

9“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ.

10A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”

11Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa,

12Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.