13Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!”
14Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị.
15Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.
16E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge.
17Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka Onyenwe anyị?” Jeremaya zara sị ya, “E, lee, a ga-arara gị nyefee gị nʼaka eze Babilọn.”