1Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn mere Zedekaya nwa Josaya eze Juda, nʼọnọdụ Konaya nwa Jehoiakim.
2Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.
3Zedekaya bụ eze, ziri Jehukal nwa Shelemaya, na Zefanaya onye nchụaja, bụ nwa Maaseia ozi sị ha, jekwuru Jeremaya onye amụma gwa ya okwu sị, “Biko, kpeere anyị ekpere, rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ.”
4Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ.