8Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya,
9“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”
10Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.”
11Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ.
12Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya.