6Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya.
7Ma Ebed-Melek, onye Kush, otu nʼime ndịisi ozi nʼụlọeze nụrụ na etinyela Jeremaya nʼime olulu mmiri. Mgbe eze nọdụrụ nʼọnụ ụzọ ama Benjamin,
8Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya,
9“Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”
10Mgbe ahụ, eze nyere Ebed-Melek onye Kush iwu sị ya, “Sị nʼebe a kpọrọ iri mmadụ atọ ka gị na ha soro gaa dọpụta Jeremaya onye amụma site nʼolulu ahụ tupu ọ nwụọ.”