15Ma Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ọ bụrụ na m enye gị ọsịsa, ị gaghị egbu m? A sịkwa na m adụọ gị ọdụ, ị gaghị ege m ntị.”
16Ma Zedekaya bụ eze ṅụrụ iyi na nzuzo nye Jeremaya sị ya, “Dịka Onyenwe anyị onye nyere anyị ume anyị na-eku si adị ndụ, agaghị m egbu gị, maọbụ nyefee gị nʼaka ndị na-achọsi ndụ gị ike.”
17Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ.
18Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ”
19Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.”