13Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche.
14Mgbe ahụ, Zedekaya bụ eze, ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, ka ọ bịakwute ya nʼọnụ ụzọ nke atọ, nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ọ bịara, eze gwara ya okwu sị ya, “Achọrọ m ịjụ gị ajụjụ. Ezonarịla m ihe ọbụla.”
15Ma Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ọ bụrụ na m enye gị ọsịsa, ị gaghị egbu m? A sịkwa na m adụọ gị ọdụ, ị gaghị ege m ntị.”
16Ma Zedekaya bụ eze ṅụrụ iyi na nzuzo nye Jeremaya sị ya, “Dịka Onyenwe anyị onye nyere anyị ume anyị na-eku si adị ndụ, agaghị m egbu gị, maọbụ nyefee gị nʼaka ndị na-achọsi ndụ gị ike.”
17Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ.