11Ya mere, Ebed-Melek duuru ndị ahụ pụọ. O buru ụzọ jee nʼọnụụlọ dị nʼokpuru ụlọakụ nke ụlọeze. Nʼebe ahụ, ọ chịpụtara ụfọdụ nkịrịnka akwa, na ụfọdụ uwe kara nka. O kenyere ha nʼụdọ, wetuore ya Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ.
12Ebed-Melek onye Kush ahụ gwara Jeremaya okwu sị ya, “Were nkịrịnka akwa ndị a, na uwe ndị a kara aka fanye ha na mkpa abụ gị, ime ka ụdọ a ghara imerụ gị ahụ.” Jeremaya mere dị ka a gwara ya.
13Emesịa, ha dọlịtere ya elu, dọpụta ya site nʼolulu mmiri ahụ. Site nʼoge ahụ, Jeremaya nọgidere nʼogige ụlọ ndị nche.
14Mgbe ahụ, Zedekaya bụ eze, ziri ozi ka a kpọta Jeremaya onye amụma, ka ọ bịakwute ya nʼọnụ ụzọ nke atọ, nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ọ bịara, eze gwara ya okwu sị ya, “Achọrọ m ịjụ gị ajụjụ. Ezonarịla m ihe ọbụla.”
15Ma Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ọ bụrụ na m enye gị ọsịsa, ị gaghị egbu m? A sịkwa na m adụọ gị ọdụ, ị gaghị ege m ntị.”