21Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nye, lee ihe Onyenwe anyị mere ka m hụ:
22A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’
23“A ga-akpụpụtara ndị Babilọn ndị nwunye gị niile na ụmụ gị niile. Gị onwe gị agaghị agbanarị ha, ma eze Babilọn ga-ejidekwa gị, a ga-esurekwa obodo a ọkụ.”
24Mgbe ahụ, Zedekaya gwara Jeremaya, “Ekwela ka ntị ọzọ nụ ihe ndị a niile mụ na gị kwuru, ma ọ bụghị ya, ị ga-anwụ.
25Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’