2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’
3Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ”
4Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.”
5Zedekaya bụ eze zara sị ha, “Ọ dị unu nʼaka. Unu maara na o nweghị ihe ọbụla eze nwere ike ime igbochi unu ime ihe unu chọrọ.”
6Ya mere, ha jidere Jeremaya, tinye ya nʼime olulu mmiri Malkija, nwa eze. Olulu mmiri a dị nʼogige ụlọ ndị nche. Ọ bụ ụdọ ka ha ji wetuo Jeremaya nʼime olulu mmiri ahụ. Ma mmiri adịghị nʼime ya, naanị apịtị. Ya mere, Jeremaya danyere nʼime apịtị ahụ, mibanye nʼime ya.