Jeremaya 4

Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?

Jeremiah 4:14 (UKJV) O Jerusalem, wash yours heart from wickedness, that you may be saved. How long shall your vain thoughts lodge within you?

12ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.”

13Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi!

14Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?

15Otu olu na-akpọsa site na Dan, ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem.

16“Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.