Jeremaya 4

“Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.

Jeremiah 4:16 (UKJV) Make all of you mention to the nations; behold, publish against Jerusalem, that watchers come from a far country, and give out their voice against the cities of Judah.

14Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?

15Otu olu na-akpọsa site na Dan, ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem.

16“Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.

17Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche, nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

18“Ụzọ gị na omume gị niile buteere gị ihe ndị a. Nke a bụ ntaramahụhụ gị. Lee ka o si dị ilu! Lee ka o si emibanye nʼime obi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.