Jeremaya 4

Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?

Jeremiah 4:21 (UKJV) How long shall I see the standard, and hear the sound of the trumpet?

19Ihe mgbu a dị ukwuu. Lee na apụghị m ịnagide ya. Obi m o, obi m o! Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim. Apụghịkwa m ịnọ jụụ. Ana m anụ ụda opi ike, na-anụkwa ụzụ agha.

20Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu, lee na a laala ala a niile nʼiyi. Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile; a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile.

21Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?

22“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”

23Elere m anya nʼụwa hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu, leekwa anya na mbara eluigwe, ma o nweghị ìhè dị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.