20Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu, lee na a laala ala a niile nʼiyi. Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile; a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile.
21Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?
22“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”
23Elere m anya nʼụwa hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu, leekwa anya na mbara eluigwe, ma o nweghị ìhè dị ya.
24Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.