22“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”
23Elere m anya nʼụwa hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu, leekwa anya na mbara eluigwe, ma o nweghị ìhè dị ya.
24Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.
25Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla, ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala.
26Ala ọma ahụ aghọọla ọzara, obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya.