25Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla, ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala.
26Ala ọma ahụ aghọọla ọzara, obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya.
27Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “A ga-ebibi ala ahụ niile, ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam.
28Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”
29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.