Jeremaya 4

Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”

Jeremiah 4:28 (UKJV) For this shall the earth mourn, and the heavens above be black; because I have spoken it, I have purposed it, and will not repent, neither will I turn back from it.

26Ala ọma ahụ aghọọla ọzara, obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya.

27Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “A ga-ebibi ala ahụ niile, ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam.

28Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”

29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.

30Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya? Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie, were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu? Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu? Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma. Ndị iko unu na-elelị unu; ndụ unu ka ha na-achọkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.