Jeremaya 4

Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”

Jeremiah 4:31 (UKJV) For I have heard a voice as of a woman in travail, and the anguish as of her that brings forth her first child, the voice of the daughter of Zion, that bewails herself, that spreads her hands, saying, Woe is me now! for my soul is wearied because of murderers.

29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.

30Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya? Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie, were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu? Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu? Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma. Ndị iko unu na-elelị unu; ndụ unu ka ha na-achọkwa.

31Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.