Jeremaya 5

“Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem, legharịa anya, ma mara, chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile. Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye, bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu. M ga-agbagharakwa obodo a

Jeremiah 5:1 (UKJV) Run all of you back and forth through the streets of Jerusalem, and see now, and know, and seek in the broad places thereof, if all of you can find a man, if there be any that executes judgment, that seeks the truth; and I will pardon it.

1“Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem, legharịa anya, ma mara, chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile. Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye, bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu. M ga-agbagharakwa obodo a

2Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.”

3Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ? Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ. I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị. Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume, ha ajụla ịchịgharị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.