Jeremaya 40

Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile,

Jeremiah 40:11 (UKJV) Likewise when all the Jews that were in Moab, and among the Ammonites, and in Edom, and that were in all the countries, heard that the king of Babylon had left a remnant of Judah, and that he had set over them Gedaliah the son of Ahikam the son of Shaphan;

9Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn: birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.

10Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”

11Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile,

12ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.

13Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.