11Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile,
12ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.
13Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa
14sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu.
15Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?”