1Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn.
2Mgbe ọchịagha ndị nche eze a hụrụ Jeremaya, ọ sịrị ya, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị nyere iwu na ihe ọjọọ ndị a ga-abịakwasị ala a.
3Ugbu a kwa Onyenwe anyị emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide Onyenwe anyị, jụ irubere ya isi.
4Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.”