2Mgbe ọchịagha ndị nche eze a hụrụ Jeremaya, ọ sịrị ya, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị nyere iwu na ihe ọjọọ ndị a ga-abịakwasị ala a.
3Ugbu a kwa Onyenwe anyị emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide Onyenwe anyị, jụ irubere ya isi.
4Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.”
5Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.” Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa.
6Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri.