Jeremaya 42

Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo Onyenwe anyị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole.

Jeremiah 42:2 (UKJV) And said unto Jeremiah the prophet, Let, we plead to you, our supplication be accepted before you, and pray for us unto the LORD your God, even for all this remnant; (for we are left but a few of many, as yours eyes do behold us:)

1Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere

2Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo Onyenwe anyị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole.

3Kpee ekpere ka Onyenwe anyị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.”

4Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.