18Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’
19“Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị,
20na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’
21Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile Onyenwe anyị Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru.
22Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”