3Kpee ekpere ka Onyenwe anyị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.”
4Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.”
5Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị.
6Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.”
7Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị.