5Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị.
6Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.”
7Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị.
8Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
9Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị: