12Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha.
13Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ.
14O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.”
15Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya,
16“Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha Onyenwe anyị gwa anyị