15Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya,
16“Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha Onyenwe anyị gwa anyị
17Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị.
18Ma site nʼoge anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja, ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na ịwụsara ya aja ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọla anyị, ọ bụkwa site na mma agha na oke ụnwụ ka anyị na-ala nʼiyi.”
19Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?”