Jeremaya 44

Ma nụrụkwanụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-adị ndụ.”

Jeremiah 44:26 (UKJV) Therefore hear all of you the word of the LORD, all Judah that dwell in the land of Egypt; Behold, I have sworn by my great name, says the LORD, that my name shall no more be named in the mouth of any man of Judah in all the land of Egypt, saying, The Lord GOD lives.

24Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt.

25Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.

26Ma nụrụkwanụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-adị ndụ.”

27Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum.

28Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.