Jeremaya 44

Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’

Jeremiah 44:4 (UKJV) Nevertheless I sent unto you all my servants the prophets, rising early and sending them, saying, Oh, do not this abominable thing that I hate.

2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha.

3Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị.

4Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’

5Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ.

6Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.