1Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros,
2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha.
3Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị.
4Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’
5Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ.