19Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya.
20“Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya.
21Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ.
22Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi.
23Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị.