Jeremaya 46

“Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta, zọpụnụ ije maka ibu agha.

Jeremiah 46:3 (UKJV) Order all of you the buckler and shield, and draw near to battle.

1Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche.

2Nke dịrị Ijipt: Ndị a bụ okwu dị megide usuu ndị agha Fero Neko, bụ eze Ijipt, ndị Nebukadneza eze Babilọn meriri nʼagha na Kakemish, nʼakụkụ osimiri Yufretis, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda.

3“Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta, zọpụnụ ije maka ibu agha.

4Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.

5Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.