3“Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta, zọpụnụ ije maka ibu agha.
4Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.
5Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
6“Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga, ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha. Ha na-asọ ngọngọ daa, nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis.
7“Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?