5Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
6“Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga, ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha. Ha na-asọ ngọngọ daa, nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis.
7“Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?
8Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl, dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị. Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile. Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’
9Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile. Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha. Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta, na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta.